1 Samuel 6

Mbughachi igbe ọgbụgba ndụ

1Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nọrọ nʼobodo ndị Filistia ọnwa asaa. 2Emesịa, ndị Filistia kpọrọ ndị nchụaja ha na ndị na-ajụ mmụọ ase jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme banyere igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị? Gwa anyị otu anyị ga-esi zilaga ya nʼala ya.”

3Ndị ahụ zara sị, “Ọ bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel, unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a.”

4Ha jụrụ, “Olee ụdị onyinye aja ikpe ọmụma anyị ga-enye.”

A gwara ha, “Dịka ọnụọgụgụ ndịisi obodo Filistia si dị ise, unu ga-eziga onyinye
Onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ i ji mee ka obi juru Chineke nʼihi etuto ndị ahụ o mere ka o too ha. 1Sa 6:5,6,9,12
oyiyi etuto ise nke e jiri ọlaedo kpụọ na oyiyi oke ise nke e jikwa ọlaedo kpụọ, nʼihi na ọ bụ otu ụdị ihe otiti ahụ ka o ji tie unu na ndịisi obodo unu niile.
5Jiri ọlaedo kpụọ oyiyi etuto na oke ndị ahụ na-emebi ala unu, si otu a nye chi ndị Izrel nsọpụrụ. Ma eleghị anya ọ ga-ewezuga aka ike ya site nʼebe unu na chi unu dị iche iche na ala unu nọ. 6Gịnị mere unu ga-eji nyịchie obi unu dịka ndị Ijipt na Fero mere? Mgbe Chineke mesiri ha ike, ọ bụ na ha ahapụghị ndị Izrel ka ha laa?

7“Wuonụ ụgbọala ọhụrụ, werekwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide nʼụgbọ ahụ. Ehi ndị a ga-abụ ndị a na-ejibeghị kọọ ọrụ ubi mbụ. Mgbe unu kegidere ehi ndị a, chịrịnụ ụmụ ha chụba ha nʼebe a na-edebe ehi. 8Werenụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị tinye nʼụgbọala ahụ, tinyekwa ihe ọlaedo ndị ahụ unu na-enye ka ọ bụrụ aja ikpe ọmụma unu nʼime igbe nta unu ga-etinye nʼakụkụ ya. Zilaganụ ya nʼụzọ ọ ga-agbaso. 9Ma guzonụ na-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọ gafee oke ala anyị banye Bet-Shemesh, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị mere ka ihe ọjọọ ndị a dakwasị anyị. Ma ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ bụrụ na ọ lọghachi, anyị ga-amata na ihe otiti a bụ naanị ihe ndaba nke dakwasịrị anyị, o sikwaghị nʼaka Onyenwe anyị.”

10Ha were dịka okwu ndị a si dị. Ha weere nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide ha nʼụgbọala ahụ, werekwa ụmụ ha kpọchie nʼọgba anụ. 11Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ. 12Ehi ndị ahụ dọkpụrụ ụgbọ ahụ gawa nʼụzọ Bet-Shemesh. Ha na-ebekwa muuu mgbe ha na-aga. Ha sogidere ụzọ ahụ na-aga. Ha echigharịghị gaa aka nri maọbụ aka ekpe. Ndị eze ndị Filistia sogidekwara ha nʼazụ tutu rute nʼoke ala Bet-Shemesh.

13Nʼoge a, ndị Bet-Shemesh nọ nʼubi na-ewe ihe ubi nke ọka wiiti na ndagwurugwu ala ahụ. Mgbe ha lepụrụ anya hụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ọṅụ juru ha obi. 14Mgbe ụgbọala ahụ batara nʼubi nwoke a na-akpọ Joshua na Bet-Shemesh, ọ kwụsịrị nʼakụkụ otu nkume ukwu dị nʼebe ahụ. Ngwangwa, ndị nọ nʼebe ahụ gbuwasịrị osisi e ji mee ụgbọ ahụ, gbukwaa ehi abụọ ahụ, were ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. 15Ndị ikom Livayị nọ nʼebe ahụ buliri igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ dị nʼakụkụ ya nke ọlaedo niile a kpụrụ akpụ dị nʼime ya, dọkwasị ha nʼelu nkume. Ndị Bet-Shemesh
Bet-Shemesh bụ otu nʼime obodo ndị Livayị ketara. Jos 21:16 Ọ bụ naanị ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Dit 10:18
chụrụ ọtụtụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nye Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ.
16Mgbe ndị eze ise obodo ndị Filistia hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼEkrọn nʼụbọchị ahụ.

17Onyinye etuto ọlaedo ise a kpụrụ akpụ nke ha nyere Onyenwe anyị dị ka aja ikpe ọmụma nʼihi ihe mere ha bụ maka obodo ndị Filistia ndị a, Ashdọd, Gaza, Ashkelọn, Gat na Ekrọn. 18Ha wetakwara oke ọlaedo a dịka ọnụọgụgụ obodo ndị Filistia si dị, bụ nke ndịisi ise ahụ nwere, obodo ndị e wusiri ike, na obodo nta niile ha. Nkume ukwu ahụ ebe a dọkwasịrị igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, bụ ihe akaebe nʼubi Joshua, onye Bet-Shemesh ruo taa.

19Ma Onyenwe anyị tigburu iri ndị ikom asaa nʼetiti ndị Bet-Shemesh nʼihi na ha nyobara anya nʼime igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Nʼihi ya ndị Bet-Shemesh ruru ụjụ nʼihi ndị ahụ niile Onyenwe anyị tigburu. 20Ndị Bet-Shemesh jụrụ sị, “Onye pụrụ iguzo nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke a dị nsọ? Olee ebe anyị ga-ezigakwa igbe ọgbụgba ndụ a?”

21Ha zipụrụ ndị ozi ka ha gaa gwa ndị Kiriat Jearim sị ha, “Ndị Filistia ezighachila igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Bịanụ buru ya gaa nʼobodo unu.”

Copyright information for IboBIU